Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 1:2 - Bible Nso

2 Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 1:2
27 Iomraidhean Croise  

Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak:


Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.


Umu-ndikom Abraham; Aisak, na Ishmael.


Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.


Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya;


Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba.


Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.


Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram;


O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.


Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n'Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa:


N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.


Akarari akàrà site n'ebo Juda orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Reuben orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Gad orú nnù na nnù iri:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan