Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 3:14 - Bible Nso

14 Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 3:14
16 Iomraidhean Croise  

Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi: Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?


N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara madu Mb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.


Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi? Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?


Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.


Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.


Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.


B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa.


Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.


Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.


Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:


Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.


Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?


Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan