Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 2:5 - Bible Nso

5 Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 2:5
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.


Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.


Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,


soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.


Were ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere; Mu onwem bu Jehova


Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan