Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 2:2 - Bible Nso

2 Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 2:2
31 Iomraidhean Croise  

Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu; Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.


Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu; Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.


Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.


Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu.


Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.


Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n'iwu diri, unu ndi-nchu-àjà.


Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.


Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?


Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.


Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan