Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 2:13 - Bible Nso

13 Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 2:13
15 Iomraidhean Croise  

Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.


Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.


Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?


Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere.


Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.


M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia.


N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.


Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.


erighm ihe sitere na ya n'iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n'adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n'iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan