I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.
Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.
Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.
Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?
Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.