Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 1:9 - Bible Nso

9 Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 1:9
15 Iomraidhean Croise  

Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.


Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike?


Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.


Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.


Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche; Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi: Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi, Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile.


Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:


Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?


N'ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M'nāgaghi-elegide.


Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.


n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.


Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan