Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Malakaị 1:7 - Bible Nso

7 Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Malakaị 1:7
14 Iomraidhean Croise  

Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.


ha onwe-ha gābata n'ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem.


Ọ dighi onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke unu gēweta nso Jehova agēji ihe nēko achicha me: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula nke nēko achicha, ma-ọbu manu-aṅu ọ bula, unu gēji sure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova.


Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ.


I gēdo kwa ya nsọ; n'ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n'ebe i nọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ.


Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.


Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.


Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.


Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.


Ma mb͕e ọlu di n'aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan