Ma mb͕e ndi nka, ma-ọbu onye-amuma, ma-ọbu onye-nchu-àjà, gāju gi, si, Gini bu ibu Jehova nēbo? I gasi kwa ha, Gini bu ibu? ọ bu na arapuwom unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,
Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.