Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 7:3 - Bible Nso

3 Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 7:3
26 Iomraidhean Croise  

Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.


Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.


Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.


ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!


Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha.


Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.


Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.


N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi;


O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe.


Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku.


Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.


N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.


Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n'uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n'aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n'agha echighari.


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


unu ndi nākpọ ezi ihe asì, ndi nāhu kwa ihe ọjọ n'anya; ndi nādọwapu ha akpukpọ n'aru, na anu-aru-ha n'ọkpukpu nile ha;


si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya.


Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan