Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 7:11 - Bible Nso

11 Ubọchi ib͕a ogige-gi nile gādi! n'ubọchi ahu ka ókè-gi gādi n'ebe di anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 7:11
12 Iomraidhean Croise  

M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.


na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.


Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n'akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n'elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha.


Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n'ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.


Gi nwanyi ewedara n'ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n'ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi.


Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.


Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.


Ha gēwu kwa ebe nile nke bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu nke ndi mbu ka ha gēwuli, me kwa ka nkpọnkpọ obodo nile di ọhu, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu nke ọtutu ọb͕ọ gara aga.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan