Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 6:2 - Bible Nso

2 Unu ugwu, nurunu okwu ikpe Jehova; nu-kwa-nu, unu ntọ-ala uwa nke nādigide mb͕e nile: n'ihi na Jehova na ndi-Ya nēkperita ikpe, ọ bu kwa Israel ka Ọ gāruso uka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 6:2
19 Iomraidhean Croise  

Ewe hu ebe osimiri si erù, Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, N'ibasi-nba-ike nke Jehova, Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.


Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.


Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike, Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:


Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche.


Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.


Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem.


N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.


Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n'ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ'gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n'elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n'okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n'ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.


Mb͕e ọ nọ n'afọ o jidere nwa-nne-ya n'ikiri-ukwu; ọ bu kwa n'ume-ya ka o jisiri ike n'ebe Chineke nọ:


Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.


Biko, nurunu ihe Jehova nāsi: Bilie, je ikpe n'iru ugwu nile, ka ugwu ntà nile nu kwa olu-gi.


N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.


emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan