Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 6:12 - Bible Nso

12 N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 6:12
29 Iomraidhean Croise  

Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, Na n'ire aghughọ.


N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.


Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


N'ihi na Jerusalem asuwo ngọngọ, Juda adawo kwa: n'ihi na ire-ha na omume-ha nile nēmegide Jehova, inupu isi n'okpuru anya abua nke ebube-Ya.


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.


Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.


Ahuhu diri ha! n'ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n'ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:


ndi nēdina n'elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n'elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n'ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n'etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba;


M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ.


Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.


Ndi-Ju we so kwa ya n'ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a.


Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan