Ma ọ gaghi-ele ebe-ichu-àjà ahu nile anya ọma, bú ọlu aka-ya, ọ bughi kwa ihe nkpisi-aka-ya meworo ka ọ gēle anya, ma ọ bu Asherim, ma-ọbu arusi-anyanwu-ya nile.
N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.
Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha; Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya: O tidaruwo ha ala: O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.
Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.