Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 4:8 - Bible Nso

8 Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 4:8
23 Iomraidhean Croise  

Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida.


Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.


Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.


Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa.


Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.


N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.


Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di, Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri, Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.


M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.


Ubọchi nke ta ọ bu nime Nob ka o gēguzo: ọ nēfeghari aka-ya n'ebe ugwu ada Zaion di, bú ugwu ntà Jerusalem.


o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n'etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia.


Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.


Gi Jekob, aghaghm ime ka ndi-gi nile zukọta; aghaghm ichikọta ndi Israel fọduru; n'otù ka M'gēdokọ ha dika ìgwè ewu na aturu nke Bọzra: dika ìgwè aturu n'etiti ebe-ita-nri-ya; ha gēme oké nkpọtu n'ihi uba madu.


M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.


Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile, Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.


Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.


O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.


kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia:


Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan