Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 4:13 - Bible Nso

13 Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn, nʼihi na aga m enye gị mpi igwe. Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz, ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba. Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị. Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 4:13
28 Iomraidhean Croise  

Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.


N'ihi ulo uku Gi nime Jerusalem Ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Na mb͕e ahu ka agēdukuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha ùtú, nke bu otù ndi di ogologo di kwa lari n'aru, nke site-kwa-ra n'otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya, rue ọnọdu aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ugwu Zaion.


Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.


Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche;


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.


Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n'ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n'elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu.


N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala, N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.


Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.


Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.


Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.


Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.


Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan