Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 4:12 - Bible Nso

12 Ma ndi ahu amaghi èchìchè nile nke Jehova, ha aghọtaghi kwa ndum-ọdu-Ya: n'ihi na Ọ chikọtawo ha dika ùkwù-ọka n'ebe-nzọcha-ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma ha amaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị, ha aghọtakwaghị nzube ya, na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 4:12
15 Iomraidhean Croise  

Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.


O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha. Tonu Ja.


Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.


Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.


Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya.


N'ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.


Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche;


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.


M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan