Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 4:11 - Bible Nso

11 Ma ub͕u a ọtutu mba achikọtawo onwe-ha imegide gi, ndi nāsi, Ka emerua ya, ka anya-ayi lekwasi kwa Zaion.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 4:11
15 Iomraidhean Croise  

Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.


N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù; Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:


Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.


Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.


Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya.


O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?


Ma elekwasila ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi emere ya ka ọ ghọ onye ala ọzọ, aṅu-kwa-la umu Juda n'ubọchi ila-n'iyì-ha; eme-kwa-la ka okwu-ọnu-gi di uku n'ubọchi ahuhu.


Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan