Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 2:8 - Bible Nso

8 Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n'uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n'aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n'agha echighari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 2:8
10 Iomraidhean Croise  

Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?


O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo: O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n'oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n'ihi nka ka M'kpọworo ya asì.


unu ndi nākpọ ezi ihe asì, ndi nāhu kwa ihe ọjọ n'anya; ndi nādọwapu ha akpukpọ n'aru, na anu-aru-ha n'ọkpukpu nile ha;


ndi nēri kwa anu-aru ndim; ọ bu kwa akpukpọ-aru-ha ka ha b͕aworo ha, ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ha b͕ajisiworo: e, ha eb͕ubisiwo ha dika ihe agēsi n'ite, na dika anu n'etiti ite ọla.


Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan