Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 2:2 - Bible Nso

2 Ha we tukwasi anya-uku n'ubi, nara ha n'ike; ha tukwasi anya-uku n'ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 2:2
28 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.


N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.


Ọ buru na alam etie nkpu megidem, Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;


Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.


Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:


Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!


Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.


onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,


Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.


Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya.


O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n'ebe a? n'ihi na ha emejuwo ala-ha n'ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha.


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,


Biko, nurunu nka, unu ndi-isi ulo Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel, ndi nākpọ ikpé ziri ezi ihe-árú, ọ bu kwa izi-ezi nile ka ha nēme ka ọ b͕agọrọ ab͕agọ.


N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan