Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 1:8 - Bible Nso

8 N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 1:8
19 Iomraidhean Croise  

Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.


Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:


M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.


Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.


Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu.


Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n'ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n'ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.


N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.


N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ.


N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.


Manu jijiji, unu ndinyom ndi nọ jū; menu nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: yipunu uwe, b͕ara ọtọ, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu.


Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.


N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.


Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.


N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.


Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan