Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 1:7 - Bible Nso

7 Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 1:7
22 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.


Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọgu arọ atọ na iri gwusiri, na Jehova gēleta Taia, o we lata n'onyinye-ikwa-iko-ya, ya na ala-eze nile nke uwa nke di n'elu uwa ewe kwa iko.


N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.


N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.


M'gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n'anya nyeworom: M'gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha.


N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.


N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.


Ọ jusiwo nwa-ehi-gi, Sameria; iwem adiwo ọku megide ha: rùe ole mb͕e ka ha nāgaghi-enwe ike ighọ ndi nēmeghi ihe ọjọ?


N'ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n'ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ.


Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.


M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi.


Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.


Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata.


N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.


Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,


Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan