Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Maika 1:13 - Bible Nso

13 Kegide ub͕ọ-ala n'inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n'ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Maika 1:13
27 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.


Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n'ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n'ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ.


Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.


Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.


Ọ je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


na Adoraim, na Lekish, na Azeka,


Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,


Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?


Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?


Madmena awaghariwo; ndi bi na Gibim gēme ka ndi-ha laghachi n'ulo ọsọsọ.


Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.


Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n'ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije.


M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.


mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.


Site n'olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n'ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha.


Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n'agu ndikom nke guru ya, na n'ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya.


N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem?


Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si,


na Lekish, na Bọzkat, na Eglon;


Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.


Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan