Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:9 - Bible Nso

9 Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:9
14 Iomraidhean Croise  

Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n'ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa.


I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.


Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.


Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku.


Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.


O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.


ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu,


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan