Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:7 - Bible Nso

7 Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:7
12 Iomraidhean Croise  

Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya:


ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.


Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha.


ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.


Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.


ọ si Eron, Were n'onwe-gi nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku, nke zuru okè ka ha gābu, gi weta kwa ha nso n'iru Jehova.


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke:


n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.


ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:


N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan