Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:4 - Bible Nso

4 chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n'iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n'ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:4
18 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa.


M'gēzute kwa umu Israel n'ebe ahu; anēji kwa ebubem do Ulo-ikwū ahu nsọ.


ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.


Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.


Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.


Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;


Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova.


Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya.


Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.


Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan