Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:24 - Bible Nso

24 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ọkụ sitekwara nʼebe Onyenwe anyị nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:24
24 Iomraidhean Croise  

O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu.


Abram we da kpu iru-ya n'ala: Chineke we kpayere ya uka, si,


Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.


Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.


Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ha we zarita onwe-ha n'ito na n'ikele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n'ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n'ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova.


Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.


Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.


Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.


Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel.


Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?


O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob, Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel: Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.


O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.


Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,


Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.


Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,


Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a.


Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan