Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:19 - Bible Nso

19 ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n'ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n'ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:19
7 Iomraidhean Croise  

Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya.


I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.


Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.


Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku, nke di n'elu nkú nke di n'elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova.


O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n'izu-okè-ya, (n'ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,


ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.


ha we tukwasi abuba ahu n'okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'ebe-ichu-àjà:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan