Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 9:15 - Bible Nso

15 Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 9:15
11 Iomraidhean Croise  

ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.


Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n'aka-ya.


Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si,


Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà.


Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan