11 Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
11 Ma anụ ahụ ya, na akpụkpọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ebe obibi.
O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu.
Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.
ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.
Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.