Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 8:4 - Bible Nso

4 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 8:4
19 Iomraidhean Croise  

Ha site-kwa-ra n'ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, me uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, me kwa uwe nsọ nile nke Eron nwere; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.


otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.


na ihe ahu ike n'úkwù, ọ bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, ọ bu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.


O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.


Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.


Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.


kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.


Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya.


Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,


N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan