Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 8:31 - Bible Nso

31 Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m'nyere n'iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 8:31
12 Iomraidhean Croise  

Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova.


Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.


Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.


N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu.


Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.


Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.


Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan