Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 8:3 - Bible Nso

3 kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 8:3
16 Iomraidhean Croise  

Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.


Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.


Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem ime ememe achicha ekoghi-eko n'ọnwa nke-abua, bú nkpọkọta bara uba nke-uku.


Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n'ọnwa nke-abua.


Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.


Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.


Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.


Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu.


N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.


Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu:


Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;


Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri.


Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri.


I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel:


Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan