Levitikọs 8:29 - Bible Nso29 Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a29 Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja mfufe, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis. Faic an caibideil |
Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.