Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 8:21 - Bible Nso

21 Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 8:21
11 Iomraidhean Croise  

Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.


Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya.


I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.


Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


ọ gāb͕ọwa kwa ya na nkù-ya abua, ma ọ gaghi-ekewa ya: onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, n'elu nkú nke di n'elu ọku: àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.


nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan