Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 8:11 - Bible Nso

11 Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 8:11
13 Iomraidhean Croise  

Mb͕e igirigi nke dikwasi n'ala rigoro, le, n'elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n'elu ala.


Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.


Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.


Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.


I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.


Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.


Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n'obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n'obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe.


otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova:


onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru akwa-nb͕ochi ahu.


onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu.


Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n'aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan