Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 7:7 - Bible Nso

7 Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 7:7
11 Iomraidhean Croise  

Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.


Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.


o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu:


Ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.


Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya.


Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya.


Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ?


Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan