Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 7:5 - Bible Nso

5 onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 7:5
13 Iomraidhean Croise  

ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēsure ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, bú ufọdu nime ọka-ya esuru esu, na ufọdu nime manu-ya, tiyere frankincense-ya nile: ọ bu àjà-ọku anāchuru Jehova.


ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n'utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:


Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.


O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,


Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.


na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya):


Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.


Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan