Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 7:37 - Bible Nso

37 Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

37 Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 7:37
11 Iomraidhean Croise  

Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,


I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu:


Jehova we kpọ Moses òkù, si n'ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si,


Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.


Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi.


Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.


O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan