Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 7:16 - Bible Nso

16 Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 7:16
17 Iomraidhean Croise  

Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.


Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;


M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,


Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova.


Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.


Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.


Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa.


Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.


nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.


Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.


mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu:


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:


Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa:


ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan