Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 7:13 - Bible Nso

13 N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 7:13
7 Iomraidhean Croise  

agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Dika onyinye iji biaru nso, bú nkpuru mbu, ka unu gēweta ha nso Jehova: ma n'elu ebe-ichu-àjà ka ha nāgaghi-arigo, ibu ihe ísì utọ.


Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu.


Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.


N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan