Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 6:27 - Bible Nso

27 Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 6:27
11 Iomraidhean Croise  

Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.


I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.


Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.


Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.


Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ.


Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya:


Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è.


ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka, nání ya: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.


n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.


Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.


N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan