Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 6:25 - Bible Nso

25 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 6:25
13 Iomraidhean Croise  

O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.


Ọ gēb͕u kwa ya n'iru Jehova n'akuku ebe-ichu-àjà chere iru n'Ugwu: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova


Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n'iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri.


o gēbikwasi aka-ya n'isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n'ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n'iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.


Ọ gēbi-kwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n'ebe àjà-nsure-ọku.


Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan