Levitikọs 6:20 - Bible Nso20 Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a20 “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi. Faic an caibideil |
Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.
Ihe-nlekọta Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà bu manu nke ihe nēnye ìhè, na ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e dum, na manu nke otite-manu ahu, ihe-nlekọta nke ebe-obibi ahu nile, na nke ihe nile di nime ya, bú nime ebe nsọ ahu na nime ihe-ya nile.