Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 6:13 - Bible Nso

13 Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 6:13
9 Iomraidhean Croise  

Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,


na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.


otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.


Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.


Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi.


Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya.


Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà.


Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan