Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 5:9 - Bible Nso

9 Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 5:9
12 Iomraidhean Croise  

Ọ tọrọ Jehova utọ, n'ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube.


Onye-nchu-àjà gēweta ya nso ebe-ichu-aja, gbupu isi ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; agāpipu kwa ọbara-ya n'akuku ebe-ichu-àjà:


Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n'iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n'iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku.


Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.


Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:


Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n'iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


N'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka ha gēb͕u ihe àjà-ikpe-ọmuma; ọ gāwusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan