Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 5:2 - Bible Nso

2 ma-ọbu mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, ma ọ bu ozu anu-ọhia ruru árú, ma-ọbu ozu anu-ulo ruru árú, ma-ọbu ozu ihe nēnuputa enuputa nke ruru árú, ma ezonariri ya ya, ya onwe-ya ewe ru kwa árú, ikpe gāma kwa ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 5:2
16 Iomraidhean Croise  

Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.


Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.


ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n'ihe-árú.


Unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka; ihe ruru árú ka ha buru unu.


Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;


Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.


ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya:


ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:


Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya.


Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú.


Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.


Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n'elu ha nāmataghi ya.


N'ihi nka Sinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu,


ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan