Levitikọs 5:12 - Bible Nso12 Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya. Faic an caibideil |
ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n'utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:
Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.
O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.