Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 5:11 - Bible Nso

11 Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 5:11
23 Iomraidhean Croise  

Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.


Ma omer, otù uzọ n'uzọ iri nke ọtùtù ephah ka ọ bu.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso Jehova bu àjà-nsure-ọku sitere n'anu-ufe, o gēsi n'etiti nduru ma-ọbu n'etiti umu-kpalakwukwu weta nso onyinye-ya iji biaru nso.


Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, ọ gēwere-kwa nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibe-ya ka ọ buru kwa àjà-nmehie: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agēme kwa ya ka ọ di ọcha.


Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;


Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.


Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.


ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.


Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.


Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi.


nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.


onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;


na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua.


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan