Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 5:1 - Bible Nso

1 Mb͕e madu gēmehie, site n'inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 5:1
22 Iomraidhean Croise  

Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?


Ihe ọ bula nke nwoke gēmehie nime ya megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a:


Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?


N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.


Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.


Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.


N'ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n'ihi na site n'ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.


Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.


Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.


Ma ọ buru na ọ sughi ha, ọ buru kwa na ọ saghi anu-aru-ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.


ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.


Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.


Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:


Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n'amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n'ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma:


Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.


Ma ọ buru na erie ufọdu nime anu nke ihe àjà nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke-atọ n'uzọ ọ bula, ọ gaghi-atọ utọ: onye nēweta ya nso, agaghi-agu ya nye ya: ihe-árú ka ọ gābu, madu nke nēri ufọdu nime ya gēbu kwa ajọ omume-ya.


Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya.


Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan